OLISA by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[INTRO] K'anyi kelee Ya n'o ruru ọlụ ya. Kelee Ya n'o kwesiri Ya. Kelee Ya n'o ziere Ya. Kelee Ya. K'anyi kelee Ya n'o ruru ọlụ ya. Jee jaa Ya mma! Tobe Olisa nk'igwe, kele Chineke nk'igwe n'digha. Kelee Ya n'o kwesiri Ya. Kelee Ya n'o ziere Ya. [REFRAIN] K'anyi kelee, kelee Olisa nk'igwe! Chineke m o! Ọ gba aka eje ọgụ! Olisa nk'igwe, kele Chineke nk'igwe n'digha. Kelee Ya Nna! Olisa n'eke ụwa m o! Ọ bụ Ya n'ekekwa ba m o! Olisa egbeo dị n'ụwa, ha bụsị ọrụaka Gị! Chukwu Nna n'eligwe, Olisebuluwa doo, wa mma mma ruolu Gị! O kwesiri Gị! Oziere Gị! Ekele dịrị Gị! Otito dịrị Gị! Ebube dịrị Gị, Olisa n'elu! Oruolu Gị. Ekele dịrị Gị! O kwesiri Gị. Otito dịrị Gị! Oziere Gị. Chi n'eme mma! [VERSE 1] Emetugeeja. Azụ bi na mmiri adịghagọgụsọ mmiri. Anyị bi n'ụwa, njọ zur'anyị ahụ! Onye njọ ka m bụ ma n'Olisa eleghanya na njọ m o. Ọnwụ r'ọ nwụ n'obe, Ọnwụ Ya k'o jiri zọọ m o. Kelee leeleenuo! K'anyi kelee, kelee Olisa kwe, ihe nile g'adị mma bi n'igwe, Ị karịsịrị! Na r'ekelanyio, Nna [VERSE 2] Chukwu kere nwata gu agagh'ekwe ka nwa agụ taa hihia. Chi ma mkpa m o, Ị n'egboro m mkpa m o! Onyinyi Ị nyere m o baruba Nna, ya ka m ji eme ọnụ. Ya ka m ji eme ngala. Agụ n'eche mba m o, Olisa ime ka. Kelee leeleenuo! K'anyi kelee, kelee Olisa kwe, ihe nile g'adị mma bi n'igwe, Ị karịsịrị! Na r'ekelanyio, Nna [VERSE 3] Nwa n'eso okenye, ọ tagh'ose ọ taa ọjị, makana aka ntịga n'akụkụ ọkụ, n'ajakwa n'akụkụ ọnụ. Onye n'eso gị n'azụ Chineke, onwer'ihe nile. Olisebuluwa n'azụ m o, ọ digh'ihe kọrọ m o. Ochendo m o! Agụ bata mgba d'awar'ọ sọ! Kelee leeleenuo! K'anyi kelee, kelee Olisa kwe, ihe nile g'adị mma bi n'igwe, Ị karịsịrị! Na r'ekelanyio, Nna

Download the sheet music

OLISA

OLISA

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
136 Downloads
Offertory Hymns Hymns
3 0

More lyrics you may want