OGE ORIRI ERUGO by Rev. Fr. J. Egbeji — Lyrics

Rev. Fr. J. Egbeji Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[OGE ORIRI ERUGO] INTRODUCTION Oge oriri erugo, oge oriri erugo. Ụmụnne m kunienụ k'anyị je rie. Anyị nwere isi ọma bụ ndị a kpọrọ na ya bụ oriri. CHORUS Ụmụnne m anyị nwere isi ọma, bụ ndị a kpọrọ na ya bụ oriri. Nri ọma Kristi nyer'anyị n'oge ochie. Mana si n'igwe ka Chukwu ji zụọ ha nri n'agba ọhụrụ, Kristi jiri onwe ya wee meer'anyị nri, Anyị nwere isi ọma bụ ndị a kpọrọ na ya bụ oriri. VERSE 1 Leenụ Nwa atụrụ nke Chukwu, Kulienụ jee nara Ya. Ọ bụ Ya kpochapụrụ njọ, Njọ nke ụwa niile. VERSE 2 Dinwenu etosighị m k'ị bata n'ime m, Ma enwere m nchekwube, Sọọsọ kwuo okwu k'ị g'azọ mụ. VERSE 3 Chetanụ mgbe ọbụla anyị riri n'ọ bụ nụa ahụ n'ọbara Kristi Dinwenu, Anyị n'ekwupụtanụ ọnwụ Ya, Wee ruo mgbe Ọ g'abịa ọzọ. VERSE 4 Jesu Kristi nọ n'ime anyị ma anyị nata ahụ n'ọbara Kristi n'ụzọ ziri ezi. Anyị kwesịrị ịgbanwe omume anyị, yie Kristi. VERSE 5 Otito, olito dịrị Chukwu Nna, Onye mere k'anyị nata oriri kachasịlụ. Ya dịkwara Nwa Ya Onye mer'uche Nna Ya, Site n'iwere onwe Ya nye, Na Chukwu Mmụọ Nsọ n'ejupụta anyị obi, Oge ọbụna anyị riri oriri nsọ. [K'ANYI KULIENU] CHORUS K'anyị kulienụ, k'anyị kulienụ, K'anyị kulienụ, k'anyị kulienụ. Jee nara Dinwenu Jesu, Onye nọ na Sakramenti nke Eucharistia. VERSE 3 Onye ọbụla gaeri achịcha nke a, Ya cheta na ọ bụ Kristi nwenu Jesu. Ọ bụ Nwa nke Chukwu ka ọ naeri, Nwa nke Chukwu ka ọ naeri. VERSE 4 K'anyị werenụ ezi obi na ịhụnanya, Na asọpụrụ Kristi, Onye zoro na Sakramenti nke Eucharistia.

Download the sheet music

OGE ORIRI ERUGO

OGE ORIRI ERUGO

By Rev. Fr. J. Egbeji
Solfa
Igbo
4 pages
28 Downloads
Communion Hymns Hymns
2 0

More lyrics you may want