KOSISOCHUKWU by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Hymns Prayer Staff & Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Chineke mo, Onyenwe mo, abịara m n'iru Gị, inye Gị ekele, Chukwu. Ana m aja Gị nma. Nna nk'igwe, ihe o soro Gị eh, n'ime ndụ mo, mebe. K'o si sọ Gị Chukwu, Ọkaka ke'r'ụwa chọọ ya nma, were m mee ihe dị Gị nma. K'o si sọ Gị eh, Chukwu Ọkaka eh, ihe o soro Gị eh, n'ime ndụ mo, mebe! REFRAIN K'o si sọ Nna. K'o si sọ Chineke Nna mo! K'o si sọ. K'o si na sọ Chineke Nna mo! Ọ dị m nma. K'oo. Ya kere ihe ọma nile dị n'ụwa, m'oji, m'ọcha. Ọ dị m nma, ọ dịrị m njọ, aga m atụrụ Gị mmamma n'obi ọcha. Ngozi Gị, Chineke Nna, o rugo m'aka. Ebe ọ masịrị Gị Chineke Nna mo, ọ masịrị mo! VERSE 1 Ọbụghị n'ịgbaka mbọ n'ezie bụ ya bụ n'ego ekwe nkpata! Chetakwa n'ihe ụwa si n'akalaka! Ụfọdụ n'ata ahụhụ n'ụwa, echere chi ha. Emekata ọ dị k'adịgh'eme! Aga m agbar'egwu, buru onyinye m, wee bịa n'iru Gị. Ọ masị Gị, Chineke Nna mo, ọ masịrị mo! VERSE 2 Ekwere mo! Oge Chukwu kacha nma n'ụwa. Ekwere mo! Ụkwa ruo oge ya, ya daa! Ngozi Chineke erusago m ka mmiri eh! Lee amara Ya n'ime ndụ mo! Aga m agbar'egwu, buru onyinye m, wee bịa n'iru Gị, ọ masị Gị, Chineke Nna mo, ọ masịrị mo! VERSE 3 Ekele ka m ji bịa. Ukwe ka m ji bịa. Egwu oyorima ka m ji bịa n'iru Gị Nna, ikele Gị n'ihe I n'eme na ndụ mo! Ahụhụ bịa na ndụ mo, aga m atabanụ ya n'obuche Gị. Añụrị bịa na ndụ mo, aga m añụrịba n'o k'o si sọ Gị! Chineke Nna mo, ọ masịrị mo!

Download the sheet music

KOSISOCHUKWU

KOSISOCHUKWU

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
13 pages
17 Downloads
Offertory Hymns Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want