Kelechi by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Ọbọrọ chi kele chi eh! Ya kele chi ya eh! Ọbọrọ chi kele chi eh! Eh! Eh! Ọ bụ sọ Chineke lo n'aka ya kam gara kuo Paa! Onyinye dị mma kam gamekuli bịa n'ihu Gị Nna Chukwu, ọ dighi onye dị ka Gị! Mmh! Mmh! Mmh!! Eh! Aaha! yoo! Eehe! N'aka Chukwu kam gara kuo Paa! [VERSE 1] Oge Chineke nyere mmadụ n'ụwa n'agwụ agwụ. Ụwa b'ahịa; ihe onye zụtara ọ buru laa. Elu ụwa b'ahịa onye zụtara nke ya ọ laa! Ụwa b'ahịa, ndị b'anyị n'ụwa b'ahịanụ o! Elu ụwa b'ahịa ndị n'eje, ndị n'alaa! Ọbọrọ chi, man' omenma n'emere onwe ya, ome njọ n'emere onwe ya. Ihe onye metara n'elu ụwa k'ọ j'ala nnuo! Ụwa abụghị ebe obibi onye sị l'ụwa em'ọnụ. Anyị nile bịara abịa! Mmadụ nile g'ala! Ọbọrọ chi, onye bulu ụzọ n'ụwa zọ! Onye zọn'ụwa zọ! Onye chụbụwa n'ike, ụwa gbanarị ya n'ọsọ! Ngwere ghara osisi a k'akpara ya! Tụkwasị Chukwu obi n'aemesia ọ gadị mma!

Download the sheet music

Kelechi

Kelechi

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
5 Downloads
Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want