CHIDINMA by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Offertory Hymns Hymns Celebrations Recessional / Dismissal Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chi di nma, I di nma, Chi n'eme nma. Onye n'enye onyinye, Chineke, Onye nma. Onyinye mara nma ka m jiri bia n'iru Gi. I diiri mu nma, Chi di nma, Onye nma. VERSE 1 Dika onye nche si atu anya chi obubo, ka mkpulobi m si eche Dinwenu: Ih'I n'emere m, Chineke, o juru m'anya. VERSE 2 Ka onye nche chekwube chi obubo, ma mu n'ezin'ulo mu, chekwube Dinwenu: Ih'I n'emere m, Chineke, o juru m'anya. VERSE 3 I nyere m amamihe, a ga m ekele Gi. I nyere m ogugu isi, a ga m ekele Gi: Ih'I n'emere m, Chineke, o juru m'anya. VERSE 4 Obu aku n'uba? Obu ihe onwu nwe? Obu ego? Obu akwa? Obu nwa? Ih'I n'emere m, Chineke, o juru m'anya.

Download the sheet music

CHIDINMA

CHIDINMA

By JUDE NNAM
Staff & Solfa
Igbo
5 pages
20 Downloads
Offertory Hymns Hymns Celebrations Recessional / Dismissal Hymns Uncategorized
0 0

More lyrics you may want