Full Lyrics
REFRAIN
Chi di nma, I di nma, Chi n'eme nma.
Onye n'enye onyinye, Chineke, Onye nma.
Onyinye mara nma ka m jiri bia n'iru Gi.
I diiri mu nma, Chi di nma, Onye nma.
VERSE 1
Dika onye nche si atu anya chi obubo,
ka mkpulobi m si eche Dinwenu:
Ih'I n'emere m, Chineke, o juru m'anya.
VERSE 2
Ka onye nche chekwube chi obubo,
ma mu n'ezin'ulo mu, chekwube Dinwenu:
Ih'I n'emere m, Chineke, o juru m'anya.
VERSE 3
I nyere m amamihe, a ga m ekele Gi.
I nyere m ogugu isi, a ga m ekele Gi:
Ih'I n'emere m, Chineke, o juru m'anya.
VERSE 4
Obu aku n'uba? Obu ihe onwu nwe?
Obu ego? Obu akwa? Obu nwa?
Ih'I n'emere m, Chineke, o juru m'anya.