Full Lyrics
REFRAIN
Ebe a bụ ebe dị egwu!
Nke a bụ Ụlọ Nsọ Chukwu,
Ọnụzọ nke eligwe.
A gakpọ ya Obieze Chukwu dị nsọ.
VERSE 1
Ọ Nna ji ike niile,
Anyị abịago ịkpọ isi ala nye Gị.
Meere anyị ebere.
Anyị bịara n'Obi Gị Chukwu.
VERSE 2
Anyị bịara n'iru Gị, Chineke,
Inye Gị ekele kwesịrị Gị.
Gee ntị n'ekper' anyị.
Anyị bịara n'Obi Gị Chukwu.
VERSE 3
Gee ntị, nụrụ olu anyị,
Gee ntị, nụr' arịrị anyị.
Denye ah' anyị n'akwụkwọ ndụ,
Anyị bịara n'Obi Gị Chukwu.
VERSE 4
Anyị ga efe Gị uwatuwa.
Biko, Chukwu mee k'anyị binyere Gị.
Ka ngọzi Gị rukwasị anyị Chineke.
Anyị bịara n'Obi Gị, Chukwu.