OBI-EZE CHUKWU DI NSO by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ebe a bụ ebe dị egwu! Nke a bụ Ụlọ Nsọ Chukwu, Ọnụzọ nke eluigwe. A gaakpọ ya Obi eze Chukwu dị nsọ. VERSE 1 Nna ji ike niile, Anyị abịago ịkpọ isiala nye Gị. Meere anyị ebere. Anyị bịara n'Obi Gị Chukwu. VERSE 2 Anyị bịara n'iru Gị, Chineke, Inye Gị ekele kwesịrị Gị. Gee ntị nụr'ekper'anyị. Anyị bịara n'Obi Gị Chukwu. VERSE 3 Gee ntị, nụrụ olu anyị. Gee ntị, nụr'arịrị anyị. Denye ah'anyị n'akwụkwọ ndụ. Anyị bịara n'Obi Gị Chukwu. VERSE 4 Anyị gaefe Gị ụwatụwa. Biko, Chukwu mee k'anyị binyere Gị. Ka ngọzi Gị rụkwasị anyị Chineke. Anyị bịara n'Obi Gị, Chukwu.

Download the sheet music

OBI-EZE CHUKWU DI NSO

OBI-EZE CHUKWU DI NSO

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
1 page
2 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want