Full Lyrics
VERSE 1
Ekwelum nkwa na mbọchị baptisma
N'agamefe Chukwu n'elu ụwa
N'agam eche nti n'okwu nke nzụkọ
N'agam ajụ otito nke ajọ mmụọ.
CHORUS
Nyelum aka O Maria kam wedebe ihe m kwere na nkwa
Nyelum aka O Maria kam wedebe ihe m kwerena nkwa
VERSE 2
Maka Onwe Ya ka Chukwu ji ke anyị,
K'anyị mara Ya wee hụ Ya n'anya
K'anyị were obi fee Ya n'elu ụwa,
Iji binyegoro Ya n'ụwa ọzọ.
VERSE 3
Onye Okike kechara anyị yie Ya,
Na mkpụr'obi, anyị yịrị Chukwu
Ma site na mmiri nke Baptisma,
Amụr'anyi ka ụmụ nke Chukwu.
VERSE 4
Aja nkiti Chukwu ji ke mmadụ
Aja nke jupụtara na adi ike.
Baptisma mer' anyị ụmụnna Jesu,
Ndi ga eketa aṅụrị nke eluigwe.
VERSE 5
Ahuhu anyi na ata ga n'elu uwa,
Nchekasi n'olu digar' anyi
Ililo n'okwu n'omume nile,
Gabụ ihe ana eji efe Chukwu.