Full Lyrics
VERSE 1
Uto nke uwa nka, ine nke uwa nka,
ekworo nk'uwa nka, emu nke uwa nka;
Nw'oge nta, nw'oge nta ha naanogide.
CHORUS
Nw'oge nta, nw'oge nta,
nw'oge nta, nw'oge nta,
nw'oge nta, nw'oge nta
ka ih'uto na ih'ilu nke uwa nka naanogide.
VERSE 2
Udo nke uwa ka, Ọñu nke uwa nka,
Aghara nk'uwa nka, M'akwa nke uwa nka,
Nw'oge nta, nw'oge nta Ha naanọgide.
VERSE 3
Uchu nke uwa ka, Mbọ nke uwa nka,
Ọbọ nke uwa nka, Ifem nke uwa nka,
Nw'oge nta, nw'oge nta Ha naanọgide.
VERSE 4
Aku dum nk'uwa ka, Uru dum nk'uwa nka,
Ukpa dum nk'uwa nka, Iyi dum nk'uwa nka,
Nw'oge nta, nw'oge nta Ha naanọgide.
VERSE 5
Otuto nk'uwa ka, M'ọjịja nk'uwa nka,
Na nkọcha nk'uwa nka, Na ntakwu nk'uwa nka,
Nw'oge nta, nw'oge nta Ha naanọgide.
VERSE 6
Ihe dum nk'uwa ka, Naeku nim'uwa nka,
Ma nk'ọma nk'uwa nka, Ma nk'ọjọ nk'uwa nka,
Nw'oge nta, nw'oge nta Ha naanọgide.