Full Lyrics
REFRAIN
Ọ ọ Nri ndị mmụọ ọma,
Ọ nri n'enye ndụ nke Kristi nyer' anyị,
Tupu ọnwụọ n'elu obe.
Ọ sị mebenụ ya na ncheta nke m o.
Ọ sị mebenụ ya k'ụnụ nwe ndụ ebighị ebi.
Nwannem ijegokwe? Ị narago?
I rigokwe? Ahụ Kristi ijegokwe?
Ị narago ọ n'enye ndụ ebighị ebi.
VERSE 1
Leenu Kristi n'ụdị achịcha naamasọ,
Nri achịcha n'enye ndụ.
VERSE 2
Leenu nwa atụrụ, nwa atụrụ nke Chineke,
Ha nwere isi ọma bụ ndị a kpọrọ na ya bụ oriri.
VERSE 3
O Dinwenum e tosirom k'ị bata n'obim,
Kwuonụ sọ okwu, kwu n'obi m gaadịrị.
O Yukaristia nri ndị mmụọ ọma n'enye ndụ,
Nke n'ebelata agụụ ori warawara nke njọ.