Full Lyrics
VERSE 1
Nri naenye ndụ bụ nri si n'igwe,
nri ndị nmụọma nke Jesu nyere anyị.
CHORUS
Bịa nụ k'anyị rie,
bịa nụ k'anyị nụọ,
rie ahụ Jesu,
nụọ kwa ọbara ya,
k'anyị wee nwe ndụ ebighebi.
VERSE 2
Jesu n'achọ obi dị nsọ,
Jesu n'achọ ahụ dị ọcha,
rie ahụ Jesu nụọ ọbara ya,
k'ị wee buru obi nta Jesu.
VERSE 3
Ọ bụ nri ọma,
ọ bụ nri dị nsọ,
ọ bụkwa nri agbamume,
nri ndị nọ n'ije nke okwukwe.