Full Lyrics
[REFRAIN]
Anyi biara k'anyi kele Gi Chukwu,
Ndi nna abiawo kpo isiala nye Gi,
Nna doo nye anyi amara Gi,
K'anyi buru ihe nyere nzuko Gi,
K'anyi buru ihe nyere uwa nile.
[VERSE 1]
O di mma ezi n'ulo bu nke si n'aka Chukwu,
Anyi n'ario Gi Chineke nonyere anyi,
K'anyi were buru ihe nyere nzuko Gi.
[VERSE 2]
N'ochichi obodo anyi ndi nna no n'isi ya,
Chichi nzuko Gi ndi nna n'ahu maka ya,
Nchekwa ezi n'ulo b'oke n'oru di iche ha,
Biko zite muo Gi ka o bu onye ndu anyi.
[VERSE 3]
Ndi bu ezi nna b'ide ji ezi n'ulo,
Anyi n'ario Gi Chineke nonyere anyi,
K'anyi wee buru ihe nyere nzuko Gi.