Naranu m rie by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Communion Hymns Eucharistic songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ụmụ Chineke naranụ m rie nụ, naranụ m rie nụ Naranụ m ṅụọ ọbara Dinwenu Nri n'enye ndụ, ndụ ebighebi Nri ndị mmụọ ozi, nri si n'igwe gbada Ọ bụ Kristi naakpọ gị bịa Nwanne m bịa, Kristi naakpọ gị VERSE 1 Onye kwere na Nwa, gaenwe ndụ ebi ebi Onye ọ bụla nke naeri anụ ahụ m Nke naaṅụ ọbara m Ọ gaenwe ndụ ebi ebi VERSE 2 Nna nke dị ndụ zitere m Mụ onwe m naadị ndụ n'ihi Nna Onye naeri anụ ahụ m Ọ gaadị ndụ n'ihi m VERSE 3 Nke a bụ nri si n'igwe gbada Ọ bụghị dịka nke nna nna unu ha riri Ha rie manna wee nwụọ Onye naeri nri a gaadị ndụ ebi ebi

Download the sheet music

Naranu m rie

Naranu m rie

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Communion Hymns Eucharistic songs Hymns
0 0

More lyrics you may want