NARANU M RIE by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Umu Chineke naranu m rie nu, Naranu m rie nu, Naranu m nua Obara Dinwenu. Nri n'enye ndu, ndu ebighebi, Nri ndi muo ozi. Nri si n'igwe gbadata, Naranu m rie, nua Obara mo. O bu Kristi n'akpo gi bia, Naranu m rie nri di nso, Naranu m nua Obara mo. Nwannem bia, naranu m rie, Nwannem bia, naranu m nua, Obara n'akpo gi, nri di nso, di nso. Nwannem bia, naranu m rie, Naranu m nua Obara. Naranu m rie, nke Dinwenu, Nri n'enye ndu, naranu m rie nu. Naranu m nua, nke a bu obara, Nke Dinwenu, nri n'enye ndu, Naranu m rie nu. Nri si n'igwe gbadata, Iko ngozi, naranu m rie, Nri di nso, naranu m rie. Obara Dinwenu mo, Nke Dinwenu, Dinwenu. [VERSE 1] Chukwu Nwa si n'eligwe bia n'uwa, O Jesu Kristi, O tara ahuhu, o nwuru onwu, N'ihi mu na gi. Mana tupu o laa n'igwe, Tupu o lakwuru Nna Ya, Jesu mer'onwe Ya, Achicha nke ndu. Achicha si n'igwe, Nri n'eny'anuri, Ebighebi, N'akpo anyi. [VERSE 2] Ahum bu ihe oriri, Obara m bu ihe onunu, Nke a bu okwu nke Dinwenu. Onye obula riri Ahu m, Onye obula, onye nzoput' ekwugo nuo, Jesu kwuru, Onye obula nke nur'obara m, G'enwe ndu, onye ahu g'enwe ndu, N'ezie ebighebi, N'akpo anyi. [VERSE 3] Jesu, Achicha di Nso oh, Oge NnaN'anyi ha no n'ozala, Chukwu nyere ha Achicha si n'igwe, N'udi manna. Man'ugbua n'oge nke anyi, Chukwu nyer'anyi Nwa Ya Jesu Kristi, Achicha di Nso.

Download the sheet music

NARANU M RIE

NARANU M RIE

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
47 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want