Nara Onyinye Anyị N'obi Ọcha by Christopher Ngana & Jude Nwankwo — Lyrics

Christopher Ngana & Jude Nwankwo Igbo Offertory Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Anyị abịala inye gị ekele, Nna, Nna, Chukwunna, Nara onyinye anyị n'obi ọcha. Nna, Nna, Nna, Chukwunna. Gbaghara mmehie niile anyị mere, Ah ah Chukwunna, Nara ya biko Chineke ma gọzie ya n'obi ebere Ma gọzie ya n'obi ebere VERSE 1 Ezi Chineke nara onyinye ụmụ gị n'enye gị, Nna ọbụ onyinye si n'akụnụba nk'i nyere anyị Anyị n'arịọ gị ka ị nara ya dị ka onyinye Abel nwa ọdịbọ gị, na aja nk'ụkọchukwu gị Melkisedek. VERSE 2 Chọta na mmiri ọzụzọ bu onyinye Chineke nyere anyị n'efu, Ọwa na anyanwụ, ha ncha kụ ọrụ aka Chukwu, Iku ume nk'i nyere anyị bụ onyinye Chukwu, Gịnị gaa gbochi anyị inye y'ekele dị mma. VERSE 3 Ọsọ rugo ụmụ Chineke, Ngwanụ, ngwanụ, ngwanụ, Kulite nụ k'anyị gaa nye ya ekele. Mak'ihuọma dị iche Chineke m'ere anyị, Ngwanụ, ngwanụ, ngwanụ, Kulite nụ k'anyị gaa nye ya ekele. Lee onwegị anya ka ihu ọrue bube Chineke ruru gị. Ngwanụ, kulite nụ, Mgbe ị nọ n'ọrịa ọbụ ya zọrọ gị, nye gị ahụike, Nyere gị ahụike, Ngwanụ, kulite nụ k'anyị gaa nye ya ekele. Mgbe ị n'agagharị ọbụ ya n'edu gị, gwa nụ, Ngwanụ, kulite nụ, Ọge erugo ụmụ Chineke, Ngwanụ, kulite nụ k'anyị gaa nye ya ekele.

Download the sheet music

Nara Onyinye Anyị N'obi Ọcha

Nara Onyinye Anyị N'obi Ọcha

By Christopher Ngana & Ju...
Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Offertory Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want