Full Lyrics
REFRAIN
Anyị abịala inye gị ekele,
Nna, Nna, Chukwunna,
Nara onyinye anyị n'obi ọcha.
Nna, Nna, Nna, Chukwunna.
Gbaghara mmehie niile anyị mere,
Ah ah Chukwunna,
Nara ya biko Chineke ma gọzie ya n'obi ebere
Ma gọzie ya n'obi ebere
VERSE 1
Ezi Chineke nara onyinye ụmụ gị n'enye gị,
Nna ọbụ onyinye si n'akụnụba nk'i nyere anyị
Anyị n'arịọ gị ka ị nara ya dị ka onyinye
Abel nwa ọdịbọ gị, na aja nk'ụkọchukwu gị Melkisedek.
VERSE 2
Chọta na mmiri ọzụzọ bu onyinye Chineke nyere anyị n'efu,
Ọwa na anyanwụ, ha ncha kụ ọrụ aka Chukwu,
Iku ume nk'i nyere anyị bụ onyinye Chukwu,
Gịnị gaa gbochi anyị inye y'ekele dị mma.
VERSE 3
Ọsọ rugo ụmụ Chineke,
Ngwanụ, ngwanụ, ngwanụ,
Kulite nụ k'anyị gaa nye ya ekele.
Mak'ihuọma dị iche Chineke m'ere anyị,
Ngwanụ, ngwanụ, ngwanụ,
Kulite nụ k'anyị gaa nye ya ekele.
Lee onwegị anya ka ihu ọrue bube Chineke ruru gị.
Ngwanụ, kulite nụ,
Mgbe ị nọ n'ọrịa ọbụ ya zọrọ gị, nye gị ahụike,
Nyere gị ahụike,
Ngwanụ, kulite nụ k'anyị gaa nye ya ekele.
Mgbe ị n'agagharị ọbụ ya n'edu gị, gwa nụ,
Ngwanụ, kulite nụ,
Ọge erugo ụmụ Chineke,
Ngwanụ, kulite nụ k'anyị gaa nye ya ekele.