Full Lyrics
REFRAIN
Anyị abịat' inye gị ekele,
nara onyinye anyị n'obi ọcha.
Etu njọ na mmehie niile anyị mere,
nara ya biko Chineke ma gọzie ya n'obi ebere gị.
VERSE 1 (Sop/Alto)
Ezi Chineke nar' onyinye ụmụ gị n'enye gị,
nna ọ bụ onyinye si n'akụ n'ụba nk'i nyere anyị
anyị n'arịọ gị ka ị nara ya dị k'onyinye
Abel nwa odibo gị, na aja nk'ụkọchukwu gị Melkisedek.
VERSE 2 (Tenor/Bass)
Cheta na mmiri ozuzo bụ onyinye Chineke nyer' anyị n'efu,
ọnwa na anyanwụ, ha ncha bụ ọrụ aka Chukwu,
ikuku n'enye anyị ndụ bụ onyinye Chukwu,
gịnị gaegbochi ihye y'ekele dị mma.
VERSE 3 (Sop/Alto/Ten./Bass)
Oge rugo ụmụ Chineke,
ngwanụ kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele.
Mak' ihuọma dị iche Chineke m'er' anyị,
ngwanụ, kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele.
Lee onwe gị anya ka ị hụ ọrụebube Chineke ruru gị.
ngwanụ, kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele.
Mgbe ị nọ n'ọrịa ọ bụ ya zọrọ gị, nye gị ahụike,
ngwanụ, kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele.
Mgbe ị n'aga njem ọ bụ ya n'edu gị,
ngwanụ, kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele.
Oge rugo ụmụ Chineke,
ngwanụ, kunitenụ k'anyị ga nye ya ekele.