Full Lyrics
VERSE 1
N'oriri Ikpeazụ Jesu rịọrọ Nna ya
Ka ya bụ n'otu n'el'ụwa
Anyị n'arịọ Gị n'oriri nke taata
K'anyị niile soro n'ịrịọ Chukwu
K'anyị ncha bụ n'otu ahụ
N'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 2
Maka nzukọ k'anyị naele n'arịọ Gị
Ka ndị otu Kristi n'ihu n'anga
K'anyị dị n'otu n'ụwa niile s'otu
Kpọbata mmadụ ncha n'akụkụ gị
K'anyị ncha bụ n'otu ahụ
N'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 3
Anyị n'arịọ ma ka ndị otu Kristi
K'I kpochigha ha tụ l'igwe atụrụ
Ka ha wee n'otu n'okpuru otu onye isi
Na Nzukọ nke jikọrọ mmadụ ncha
K'anyị ncha bụ n'otu ahụ
N'ime Sakramenti dị asọ.
VERSE 4
A geg'eru mgbe Sakramenti g'agwụ
O Jesu kpọbata nyi n'eligwe
K'anyị so ndị mmụọ ọma na ndị niile dị nsọ
Hụ Gị n'anya n'añụrị na ndokwa
K'anyị binwe n'ebe Atọ n'ime'otu
Dị ngọzi.