MUỌ NSỌ GBADATA by Fidelis Ikenna Mbanefo, C.S.Sp — Lyrics

Fidelis Ikenna Mbanefo, C.S.Sp Igbo Pentecost Hymns Sequence hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Ọkasia kasi, Muọnsọ gbadata! Chukwu Muọnsọ si n'igwe bata n'obi anyi bilini, si n'eligwe zidata ife gi nwa n'amuke. [VERSE 1] Bia o biko Muọnsọ ọkwa Ngi bu Nna ndi ogbenye. Bia O Chukwu muọnsọ ngi aka n'eny' onyinye, mukesịa n'ime obi ndi kweli n'onye nkasi obi. [VERSE 2] Bia bata n'obi nke ndi Gi na Gi k'obim naachọ. [VERSE 3] Ọkwa ngi buezumike ndi nọ na ndọli, ntuoyi n'og'ekpomọku n'onye nkasi obi. Ziteli n'any'ife Gi a kachasili wee di asọ, k'o wee juputakwa n'im'obi ndi kweli na Gi. [VERSE 4] E weru ka ngi n'uw'ọ gini ka mmadu gaapụ ime. E weru ka ngi n'uw'ọ gini ka mmadu gaapụ ime. I sechapụziakaị na mmad' o bu n'anya naa. [VERSE 5] Bia o biko sachapụ ife lụlụ alụni. Bia kị k'ru mmir'oyi k'igbakwasi obi ose n'ụwa, gwọọn'anyi ọya di anyi n'ime ka ọy'anyi wee naa. [VERSE 6] Gọzie kwo ọkpọnku k'if'oyi ji nyal'ọkụ, bia dozieni ụkwụ n'agafie nye ndi kweli na Gi nnukw'onyinye. Welu onyinye asaa Gi nye ndi tụkwasali Gi obi n'ụwa, bia o k'iwelu nzọpụta k'i wee kw'anyi ụgwọ, ụgwọ nk'ibi ezi ndu, Muọnsọ k'iny'anyi añụri, añụri di ọkpụ. Amen!

Download the sheet music

MUỌ NSỌ GBADATA

MUỌ NSỌ GBADATA

By Fidelis Ikenna Mbanefo...
Staff & Solfa
Igbo
1 page
0 Downloads
Pentecost Hymns Sequence hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want