Full Lyrics
[REFRAIN]
Mma mma Jesus ekele
Mma mma Jesus ekele
Mma mma Jesus ekele, a nam asị Gị
Mma mma Jesus ekele
Nye nwụrụ n'obe maka mmehie mu o
Wee zọpụta mo
Ezem Jesus nara ekele mo otito mo
Nara m bulie elu mo
Ị zọrọ mu n'agbụ nke njọ
[VERSE 1]
Ekele, ekele keleere mu Eze Jesus
Nwoke d'ike, Odogwu, Eze k'eze
Nwoke mara mma nara ekele mo
Biko nar'otito
[VERSE 2]
Nke m n'ebunye Gị
A pịara Gị ihe n'ihi mo
E kpubere Gị okpu ogwu n'ihi mu o
Amara Gị ube
Enyere Gị nkparị, a kpọ gidese Gị n'obe
Ị nwụrụ ọnwụ
Nọọ abalị atọ n'ili
Ma Ị biliteere n'ọnwụ
Ekele dịrị Eze k'eze, ekele
Meri ekwensu sachapụ mmehie mo
Ekele dịrị Eze k'eze, ekele
[VERSE 3]
Ọnụm ezughị oke iji wee kele Gị
Ma site n'ịhụnanya n'ebere Ị nwere n'ebem
Na nabata nwa Gị o
Nabata ekele mo biko
[VERSE 4]
A nam ekwe Gị nkwa site taa
Eze Jesus na m g'edobe iwu Chukwu Nna
Hụ mmadụ ibe mu n'anya
Jụkw'ekwensu na ọrụ ya nile
Nyere m aka biko, biko Jesus