Full Lyrics
INTRO
K'anyị laba nụ na Missa agwụsigo
REFRAIN
Ekele dịrị Chukwu
K'anyị laba nụ na Missa agwụsigo
Ekele dịrị Chukwu
Otito dịrị Chukwu
K'anyị laba n'udo na Missa agwụsigo
Ekele dịrị Chukwu
VERSE 1
Dinwenu ka ngọzi gị dube anyị
Mee ka ịhụnanya gị juputa n'ime anyị
Biko mee k'anyị jiri ezigbo obi naeso ụzọ gị
VERSE 2
Anyị n'enye gị ekele n'esekpuru gị
Maka Oziọma gị naenye añụrị
Ka mkpụrụ oriri dị asọ anyị natara
Ju n'obi na n'ime ndụ anyị
CODA
Otito dịrị Nna na Nwa na Mmụọ Nsọ
Etu ọ dị n'izizi na kitaa na mgbe niile
Ruo mgbe ebighebi. Amen!