Full Lyrics
REFRAIN
Lee nu Ada, ada, ada n'amaghi nwoke
K'o no kuru nwa ya o n'aka.
VERSE 1
Maria k'anyi na ekwu okwu ya
Ezinne mutar'anyi Jesu nwa ka nwa.
Dika onye muoma siri kwu
Mary i g'atu r'ime muo nwa nwoke.
Aha o g'aza bu Emmanuel
Nke putara Chukwu nonyer'anyi.
VERSE 2
Ndi muozi n'egori na Mary amugo Jesu
Ha n'ekw'ukwe n'eto Dinwenu
Ndi muozi n'ekwe otito diri Chukwu
N'uwa udo diri mmadu nd'ihe ha n'aso Chukwu.
Ndi nch'aturu biara hu ihe muozi gwara ha
Ebe Mary nyibere nwa ya Jesu n'ul'anu.
VERSE 3
Ndi eze ato nyere Jesu onyinye
Ol'edo na Frankinsens na mea.
Afo mutara Jesu bu afo dinso
Maria ada nk'Anna nne dinso.
Ihe achakwasig'uwa site na ada Anna
Agbogho n'amaghi nwoke nne onye nzoputa.
VERSE 4
Mary no n'ul'anu Joseph nokwa ya
Ezin'ulo di aso oh obu ih'onu
Obu ih'omimi na ihe itunanya
Nyere mmadu nile ekele diri Chukwu.
Nuriba goribe nuo ala Judea
Ezinulo David tobe nu Chukwu.