Full Lyrics
REFRAIN
Onye nwụr'ọnwụ n'elu obe, k'O wee zọpụt'anyị;
Jesus, I bu nke mo.
VERSE 1
Onye gbar'ọsịsọ nke ọnwụ n'ogige Gethsemani.
Onyenwem Jesus, Onyenwem Jesus.
Ọsịsọ Gị niile bụ maka ndị nke Gị.
Onye nwem Jesus, Onye nwem.
VERSE 2
A pịarụsịrị Gị arụ ebe I n'azọpụta m.
Jesus Onye obi ọma, Jesus Onye dị nma.
Ahụhụ Gị, Jesus, bụ n'ihi m O!
Onye nwem.
VERSE 3
I diri ihere niile maka njọ m.
Jesus! O! Jesus!
I diri mkparị niile maka mo, Jesus.
Onye nwem, Jesus. Onye nwem.
VERSE 4
Ada Jesus n'ụzọ Calvary;
ugbor'atọ k'O dalụ n'okpuru obe.
Onye nmehie, ị daa, kunite na Onyenw'anyị
Jesus g'enyere gị aka.
VERSE 5
Akwa Jesus, mkpu Jesus,
anya mmiri Jesus n'elu obe.
Ahụhụ Jesus, ọ n'ewute m n'obi.
Onye nwem Jesus, cheta mo.
VERSE 6
Aka nke Jesus gbasara n'elu obe,
k'O ji akpọ mụ na gị.
Ọbara nke Jesus gbafuru n'elu obe,
k'O ji sacha njọ mụ na gị.
VERSE 7
Ọnwụ Jesus, ọnwụ Jesus,
ọnwụ Jesus n'elu obe!
Jesus Christ wee nwụọ n'ihi m.
Ọnwụ Ya kpọchapụrụ njọ anyị.
VERSE 8
Onye nmehie, onye arụrụ ala,
mak'ihi gị ka Jesus jiri nwụọ.
Chegharịa ugbua, bịa kwute Jesus
ka Onyenw'anyị Jesus gọzie gị.