Full Lyrics
REFRAIN
Oh! Chineke gbaghara.
Mee ebere Nna, Onyenw'anyi doo.
Njọ nilem mere, Chineke mo, gbaghara.
VERSE 1
Ike agwụgo mo n'ajọmume
m were yọba Chineke Nna, Ony'ọma.
VERSE 2
Njọ agbugo mo Nna n'ezie,
anam ayọzi Chineke Nna, Ony'ọma.
VERSE 3
Mkpur'obi mo n'achọsi G'ike
ewo! Chineke Nna, Ony'ọma.
VERSE 4
Chukwu Nna, Ony'obi ọma,
cheta nkwa Gị Onye kerụwa ma gbaghara.
VERSE 5
Afọma Gị Chineke bar'ụba,
a nam atụkwasị obi na ebere Ony'ọma.