Full Lyrics
REFRAIN
Leenu nwanyị bịar'ụka nwa k'ọ nabata n'ụlọ Chukwu
Ka Chineke gozie ya na nwa ya
VERSE 1
Nwanyị añụrị dị gị n'obi maka ihe Chukwu meere gị
Añụrị a gaadịgide n'ime ezinụlọ gị
VERSE 2
Zuo nwa gị ka o to n'egwu nke Chukwu
K'a mara Chineke ba uba na ndụ ya
Amamihe Chukwu agaghị akọ n'ime ya nwa ncha
Ngozi Chineke zosa nwa taa n'ahụ
VERSE 3
Chukwu Nna gozie, gozie nwata nke nọ n'ụlọ gị
Chukwu Nna gozie ezinụlọ mụrụ nwa doo
Chukwu Nna chebe, chebe nwata n'ụtụtụ doo, n'ehihie, n'abalị
Ezinụlọ mụrụ nwa, chebe ha biko
Ekwena ka ihe ọbụna bụ ihe ọjọọ mee ya Nna
Ekwena ka ihe ọ gaeri kọ ndị mụrụ ya
N'uje n'ụla dube ya na ya, dube ya Nna n'okporo ụzọ
Dube ya, dube ya na ndụ ya niile Chukwuma