Kunienu K'anyi Jenu Rie by Sam Ojukwu — Lyrics

Sam Ojukwu Igbo Communion Hymns Benediction & Adoration Hymns Holy Trinity Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Kunienu k'anyi jenu rie, Kunienu k'anyi jenu rie, Kunienu k'anyi jenu rie, Eye, k'anyi jenu, umunnem, k'anyi jee, rie, nua; k'anyi jee rienu, nuanu; ahu n'obara Nwaturu. Aku nwere n'ime ya ihe uso nile O riri nri a nuny n'enye ndu ebigh'ebi Chetanu'o riri ayi anata bu ahu n'obara Kristi Chetanu'o bu Sacrament nke Eucharistia. VERSE 2 Lokenenu k'osi bul'uche Chukwu i wer'onwe ya meera nyi nri, meera nyi nri, nke ndu ebebe. Lokenenu k'osi bul'uche Chukwu, bul'uche Chukwu, bul'uche Chukwu, i wer'onwe ya meera nyi nri nri mkpur'obi, meera nyi nri nri nke ndu ebebe. VERSE 3 K'anyi sekpuere Dinwenu Kristi K'anyi sekpuere Dinwenu na Sacrament nke kachasi nso K'anyi sekpuere Dinwenu K'anyi tie isi ala gbue ikpere nye Dinwenu K'anyi sekpuere Dinwenu, Onye gosigoro anyi ebere Ya. CHORUS Ndi otu Kristi, bukotanu ih'egwu di mma. Bukotanu ih'egwu di oke onu chirin'une n'ubokwata too Ya wetan'ubo were nune were nune, were nu egwu otiti Buoro Ezebube Chukwu anyi abu oma. Buoro Ezebube Chukwu anyi abu oma. OTITO Otito na ngozi diri Chukwu Nna na Nwa na Chukwu Mmuo Nso. Nsopuru diri Chineke nime otu di ngozi ugwu nidi nso diri Ya ugwu nidi nso diri Ya ebebe. Amen, ugwu nidi nso, ugwu nidi nso, ugwu nidi nso diri Ya ebebe. Amen. Amen.

Download the sheet music

Kunienu K'anyi Jenu Rie

Kunienu K'anyi Jenu Rie

By Sam Ojukwu
Solfa
Igbo
5 pages
19 Downloads
Communion Hymns Benediction & Adoration Hymns Holy Trinity Hymns
0 1

More lyrics you may want