Full Lyrics
REFRAIN
Kristi Dinwenu Ụkọchukwu ebebe
Na ehunyea chịcha na mmanya
Dịka Melkisedek.
VERSE 1
Dinwenu gwara Nnamukwu
Nọdụ ala n'aka nri m.
Agam' edote ndị iro Gị
N'okpuru Ụkwụ Gị.
VERSE 2
Onyenwe anyị ga esi na Zion
Zite mkpọ Eze nkeike Gị
Chịwa ọchịchị n'etiti
Ndị iro Gị.
VERSE 3
Eze site n'ụbọchị amụrụ Gị
N'elugwu dị nsọ.
Tupu chi efo esirim
N'afọ m mụta Gị.
VERSE 4
Onyenwe anyị ṅụr' iyi
Na ọ ma echegharị
Ị bụ ụkọchukwu ebebe
Dị ka Melkisedek mgbe ochie.