Kristi Emerig'onwu by Nduka Aku — Lyrics

Nduka Aku Igbo Easter Hymns Holy Trinity Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ụmụnne m ṅụrịa nụ, Kristi ebiligo n'ọnwụ O biligo n'ọnwụ K'otito n'ugwu na nsọpụrụ dịrị gị mgbe dum Kristi emerigo, o merigo o Merigo ọnwụ eh, Kristi emerigo o, merigo ọnwụ VERSE 1 Ọ tara ahụhụ Ọ nwụrụ anwụ Mana obilitere n'ọnwụ Kristi emerigo ọnwụ Nwanne m k'anyị ṅụrịba K'anyị ṅụrịba k'anyị tie merigo ọnwụ VERSE 2 Ha họpụtara ndị nche Ka ha chebe ili Jesu Mana ha chere nche Mbọsị mbụ wee ga Ha chere nche Mbọsị abụọ wee ga Mana mbọsị nke atọ Dike bilitere n'ọnwụ O bilitere n'ọnwụ O bilitere n'ọnwụ VERSE 3 Otito dịrị Chukwu Nna Dịrị Chukwu Nwa Dịrị Chukwu Mmụọ Nsọ Atọ n'otu dị ngozi Kristi emerigo O merigo ọnwụ

Download the sheet music

Kristi Emerig'onwu

Kristi Emerig'onwu

By Nduka Aku
Solfa
Igbo
2 pages
3 Downloads
Easter Hymns Holy Trinity Hymns
0 0

More lyrics you may want