Full Lyrics
[CHORUS]
Kpadoro onwe gị akụ n'eluigwe
n'eb'ọ gaghị agba ntu
ebe a ịdịghị ego gh'ata ya
Kpadoro onwe gị akụ n'eluigwe
ebe ndị ohi a dighi ebiwa ezu.
[VERSE 1]
Fee Chineke ọfụma n'ụwa
wer'okwukwe fee ya
okwukwe na ezioru.
Fee Chineke ọfụma n'ụwa
ọ g'enye gị ndụ ebighebi.
[VERSE 2]
Ịhụnanya bụ nanị ya bụ
Iwu Chukwu tiri anyị k'anyị hụ Ya
n'anya hụkwa mmadụ ibe anyị n'anya dịka Ya
Wer'ịhụnanya fee
fee Chukwu kere anyị k'ụba gị dị ukwu n'eluigwe.
[VERSE 3]
Ebe akụ gị dị, ebe ahụ k'echiche gị dị
chọwa akụ nke g'a
dịgide na nke sitere n'obi nile fee Chukwu
Chekwube na
Chineke fee Y'ọfụma
Ị n'akpadoro onwe g'akụ n'eluigwe.