Ka M'metu Y'aka by Harcourt Whyte — Lyrics

Harcourt Whyte Igbo Communion Hymns Lenten Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Anụrụm akụkọ n'ihunanya Nezie, nke nkasi obi e, na nzọpụta; Bayere onye nke si n'igwe bia N'ezie, O si n'elu bia, bu Mesaịayi. VERSE 2 Welite onye gi Nkpur'obi nkem, Nezie, tufu ihere, e, n'obi abụa; Jebe k'ihu onye nke si n'igwe bia, N'ezie, O si n'elu bia, bu Mesaịayi. VERSE 3 Ọ digh onye nke Ọ ga achupu, Nezie, m'ọbu onyisi, e, m'onye ngwọrọ; Ọbụn'onye mmehie nke ka si njọ Jịsụs ga azọpụta, e, Mesaịayi. VERSE 4 Ọ b'ezie, arụ nkem adịgh ike, Nmehie jurum arụ, e, m'b'oru iwe; Ka m'were nwuta na njọ nkem nile Jekwuru kw'onye nwem, e, Mesaịayi. REFRAIN Ka m'je ka m'metu Y'aka: Bitu Ya nani aka. Ọbụna m'metu Y'aka, Bitu Ya nan'aka, Ọ ga azọpụtakwam.

Download the sheet music

Ka M'metu Y'aka

Ka M'metu Y'aka

By Harcourt Whyte
Staff & Solfa
Igbo
1 page
0 Downloads
Communion Hymns Lenten Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want