Full Lyrics
CHORUS
K'a g'asị na ha maghị n'ọ bụ Mezaya,
ndị Juu jidere Jesu kpọgbue,
o bere akwa.
O tiri mkpu n'elu obe,
"Eloi lama Sabaktani".
O sikwara ọ gwụla, o kubie.
Judas rere Jesu,
Pita gọnarịrị ya,
Jọnụ gbara ọsọ mgbe ndị Juu jidere ya.
Ha boro y'ebubo,
ha pịara ya ihe,
ha mara ya ụra,
ha gbakwara y'ọtọ.
VERSE 2
Ị bụrụ Mezaya si n'elu obe rịdata,
ị bụrụ Mezaya zọpụtanụ onwe gị.
Ọ bụrụ n'ịbụ nwa Chineke gwa ny'onye kụrụ gị ihe,
ị bụrụ Mezaya mee nk'iji bụrụ chi.
VERSE 3
Ghara Jesu, ghara Jesu, ghara.
Ghara onye ahụ a mara ube,
ghara isi ahụ ekpubere okpu ogwu,
ghara obi agbawara agbawa.