Full Lyrics
CHORUS
Umunnem bianu k'anyi kpoo isiala nye Onyenweanyi,
K'anyi kpoo isiala nye Oseburuwa,
Onye ker'Eligwe n'ala.
VERSE 1
Umu Chukwu k'anyi jee, k'anyi jee n'ulo Onyenweanyi,
K'anyi jee gbuoro Ya ikpere daara Ya n'ala.
VERSE 2
Ony'obula kulite k'anyi jee,
K'anyi jee kelee Chineke tuoro Ya mmamma.
VERSE 3
Aja di nso k'anyi naachuru Ya,
Aja di oke onu k'anyi naachu.
VERSE 4
Batawanu unu bu ndi nke Ya,
Batawanu k'anyi kelee Chukwu.