Full Lyrics
REFRAIN
Onye a kpọgburu n'obe ebilitego
Onye a kpọgburu n'obe dike n'agha omerigo, o bilitere n'esie
O bilitego, o bilitego n'ike n'ebube ya
Ụwa nile kwebe nụ kwe ukwe aṅụrị
Onye nzọpụta anyị Jesu bilitere n'ọnwụ eh
N'ihi na ọnwụ enwerozi ike n'ebe ọ nọ
Jesu bilitere n'ọnwụ n'ezie
VERSE 1
Jesu Dinwenụ bịara n'ụwa
Taa ahụhụ were nwụọ maka njọ anyị
Ọ mechaa bilite n'ọnwụ n'ụbọchị nke atọ ka o siri kwuo
VERSE 2
Jesu meriri ọnwụ merie Ekwensu
Merie ike ili k'anyị ṅụrịba nụ
K'anyị kwebe ukwe aṅụrị
N'ihi na ọnwụ enwerozi ike n'ebe ọ nọ
VERSE 3
Mbilitere n'ọnwụ Kristi wetara udo
N'ime ụwa si na ya nweta nzọpụta
K'anyị ṅụrịba makana onye nzọpụta anyị emerigo ọnwụ
VERSE 4
Ekele dịrị Chukwu makana Kristi bilitere n'ọnwụ ka o siri kwuo
Ụmụnne m k'anyị ṅụrịba nụ n'ihi na
Ihe nile nwụrụ anwụ na ndụ anyị
Esorola Kristi bilite