I KWERELA NA CHINEKE? by Chima Kenneth C. & Osinakachi Akuma Kalu — Lyrics

Chima Kenneth C. & Osinakachi Akuma Kalu Igbo Creed (I believe) Hymns Solfa notation

Full Lyrics

INTRO I kwerela na Chineke? I kwerela? I kwerela? CREED E kwerem n'otu Chukwu, e kwerem n'otu Chineke, Nna onye nwe ke niile. Onye mere eluigwe na ụwa, na ihe niile a naahụ anya na ihe anaghị ahụ anya. E kwerem, e kwerem n'otu Chukwu. E kwerem na sọ otu nwa ya, onyenweanyị Jesu Kristi, Nna mụrụ tupu ụwa niile. Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu, ihe si n'ihe. A mụrụ ya amụ emeghi ya eme. Nna bụ otu ihe n'ọdịdị ebighebi ha ji bụrụ. Onye si na ya mee ihe dum, ma k'ihi anyị bụ mmadụ na mak'ihi nzọpụta anyị siri n'eluigwe gbadata. O wee r'ahụ na vejin Marria site n'ike nke mmụọ nsọ, bụrụ mmadụ. A kpogbue ya n'elu obe n'oge ọchịchị Pontius Pilate. Ọ nwụọ, e lie ya. Ma o bilitere n'ụbọchị nke atọ ka akwụkwọ nsọ siri kwuo. Ọ rọgọrọ n'eluigwe n'ọdụ n'aka nri Nna. Ọ gaabịaghachi ọzọ, n'ebube ya, n'ebube ya ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, ọchịchị ya enweghị njedebe. E kwerem na mmụọ nsọ Dinwenu na onye n'enye ndụ, onye si na Nna na nwa pụta, onye a n'esekpuru n'etokodo ya na Nna na nwa, onye si na ndị amụma kwuokwu. E kwerem n'otu nzukọ nsọ Katolik n'Apostolik. E kwuputam otu mmiri Chukwu maka mgbaghara njọ. A nam atụanya mbịlite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa g'abịanụ. Amen, e kwerem n'otu Chukwu.

Download the sheet music

I KWERELA NA CHINEKE?

I KWERELA NA CHINEKE?

By Chima Kenneth C. & Osi...
Solfa
Igbo
2 pages
30 Downloads
Creed (I believe) Hymns
0 0

More lyrics you may want