IKE EUCHARISTỊA DỊ ASỌ by Virgilus C. Eze — Lyrics

Virgilus C. Eze Igbo Communion Hymns Eucharistic songs Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Achịcha si n'igwe nrịọma Kristi nyere anyị Ọbara dị oke ọnụ mmanyaọma bụ ike n'onwe ya Kristi naakpọ anyị k'anyi jee rie ma nụọ Maka ntị n'ezie ike dị na Eucharistia nke n'enye ndụ CHORUS Ike ike ike dị na Eucharistia Ike ike ike dị na Eucharistia Ike ike ike, nnukwu ike dị na nwa nne m Ike dị n'ahụ n'ọbara Jeso Kristi Onye riri ya nụkwa mmanya ọma a gaanata Nata ike adị m asọ Jeso gaebiri n'ime ya VERSE 2 Jeso mere achịcha ka ọ ghọrọ ahụ ya Mekwazia manya ka ọ ghọrọ ọbara ya Kristi naakpọ anyị k'anyi jee rie ma nụọ Maka ntị n'ezie ike, gee m ntị n'olu Ike ike ike dị na ya ike VERSE 3 N'ezie ọ bụ nnukwu ihe itụnanya nyere anyị Na Kristi were onwe ya nye anyi n'ụdị achịcha na mmanya Gịnịzị kpatara anyi ji jụ ịnata ya? Ngwa k'anyi bilie jee rie ma nụọ Maka ntị n'ezie ike, gee m ntị n'olu Ike ike ike dị na ya ike VERSE 4 Oriri dị asọ n'abawanye ndụ nke gratia n'ime anyị Wee naebenatara anyị ọlịwalawala naagụụ ime njọ Naenyekwazi anyị mbe nke ndụ ebebe Ọ bụ ya mere Kristi ji akpọ anyị k'anyi jee rie ma nụọ Maka ntị n'ezie ike, gee m ntị n'olu Ike ike ike dị na ya ike Dị na Eucharistia dị asọ

Download the sheet music

IKE EUCHARISTỊA DỊ ASỌ

IKE EUCHARISTỊA DỊ ASỌ

By Virgilus C. Eze
Solfa
Igbo
4 pages
4 Downloads
Communion Hymns Eucharistic songs
0 0

More lyrics you may want