Full Lyrics
CHORUS
Ekele dịrị gị Nna dalụ o,
Otito dịrị gị Chineke onye ukwu,
Ọjịja mma dịrị gị Nna chin'eme mma,
Nara ekele m o n'ihi ih'i mere akarịka.
VERSE 1
Ekele ka m jiri bịa Chukwu m o,
Nara ekele maka ndụ i nyere mụ na ezinụlọ m o,
Nara ekele m o n'ihi ih'i mere akarịka.
VERSE 2
Nara ekele m o Chukwu m ji eme ọnụ,
Ọdụm ije, anya m ji ahụ ụzọ,
Ị n'echekwa m n'ụzọ ọchịchịrị niile,
Nara ekele m o n'ihi ih'i mere akarịka.
VERSE 3
Onye inyeaka m n'oge mkpa dalụ o,
Olileanya m n'oge m'enweghị olileanya,
Ị nyere m akụnụba n'oge m atụghị anya ya,
Nara ekele m o n'ihi ih'i mere akarịka.
VERSE 4
Ị dị mma, ị dị ukwu Chukwu Nna m o,
Ọkaka, ọrụ aka gị ebuka,
N'ọrịa m niile ị n'emere onwe gị aha,
Nara ekele m o n'ihi ih'i mere akarịka.