Echegbul'Onwe I by Harcourt Whyte — Lyrics

Harcourt Whyte Igbo Hymns Prayer Staff & Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Echegbul'onwe i, Chukwu b'ezi Nna; Echegbul'onwe i, Ọ naechere gi. Na nkpa nile na mmegbu, n'im'ufu nile nke ndu: Na nrafu nile nk'uwa; Ọ nọ nechere nwa: N'aghara nile nke ndu, n'egwu nile di n'uwa: Nime nsogbu, nime nchegbu n'etiti mm'agha; Chukwu nk'igwe n'uwa, nọ n'eb'Ọ nọ, n'igwe, Naechere umu nke Ya. VERSE 2 Echegbul'onwe i, Chukwu b'ezi Nna; Echegbul'onwe i, Ọ naechere gi. N'ibu nke gi di arọ, n'uzọ nke gi di anya: N'ọnọdu nile nk'inọ Ọ nọ nechere nwa: N'ikw'emo nile nk'uwa, na nlele nile nke ndu: Nime nkwutọ, nime ntakwu, n'etit'ebubo; Chukwu nk'igwe n'uwa, nọ n'eb'Ọ nọ, n'igwe, Naechere umu nke Ya. VERSE 3 Echegbul'onwe i, Chukwu b'ezi Nna; Echegbul'onwe i, Ọ naechere gi. Nime mberede nile, nime iz'ihi nke ndu: N'eje agha nile nke ndu; Ọ nọ nechere nwa: N'im'ọnya nile nke ndu, n'im'ọbu nile nk'uwa: Netiti ngu, netiti nkọ, netiti ogwu; Chukwu nk'igwe n'uwa, nọ n'eb'Ọ nọ, n'igwe, Naechere umu nke Ya. VERSE 4 Echegbul'onwe i, Chukwu b'ezi Nna; Echegbul'onwe i, Ọ naechere gi. Ka ntukwasi uche gi, ya na nkasi obi gi, Buru nime Ya, n'ihi n'Ọ nọ nechere nwa: K'otuto na nsọpuru nke si nime obi gi, Buru nke Nna, na nke Nwa Ya, na nke Mọ di nsọ; Atọ nime otu nọ n'eb'Ọ nọ, n'igwe, Naechere umu nke Ya.

Download the sheet music

Echegbul'Onwe I

Echegbul'Onwe I

By Harcourt Whyte
Staff & Solfa
Igbo
1 page
1 Downloads
Hymns Prayer
0 0

More lyrics you may want