Full Lyrics
VERSE 1
Oge nke Chineke ka mma, Chere Ya:
Ọbuna m'ọgahu di anya, Chere Ya:
Ekwela k'obi da mba, Chere Ya:
Mgb'oge ruru Ọ gaabia kwa; Chere Ya.
REFRAIN
Chukwu nk'igwe naecheta gi, Chere Ya:
Ọdigh mgb'Ọ gaechefu gi, Chere Ya:
N'ezie, ihe bayere gi, ha nile,
naemetu Chineke n'obi: Chere oge Ya.
VERSE 2
Ọbuna ma ike gh'ujọ, Chere Ya:
Ọbuna ma akọ gbọ nzuzu, Chere Ya:
Ihe r'agagherugi aru, Chere Ya:
M'ike gi diri na Chukwu: Chere Ya.
VERSE 3
Uche nke Chineke ka mma, Chere Ya:
Ọbuna m'uwa kpọ ya nzuzu, Chere Ya:
Ijuanya gaabia n'ikpeazu, Chere Ya:
Mgb'uche Chukwu gaenwu k'ihe: Chere Ya.
VERSE 4
Obi gi gaadi kw'arọ, ma Chere Ya:
Aru gagba wuruwuru, ma Chere Ya:
Mgbe oge nke Chukwu zuru, Chere Ya:
Nnabi na mgbochi gaagwu: Chere Ya.
VERSE 5
Onyinye nke Chukwu ka mma, Chere Ya:
Ọbuna m'ihe nile kọ gi, Chere Ya:
Ezihe k'ighagh inata, Chere Ya:
N'aka Chineke bu Nna gi, Chere Ya:
VERSE 6
Nkpụr'obim, biko nọ ji, Chere Ya:
Ọ ghagh ibia, bu onyenwe gi, Chere Ya:
N'ututu m'ọbu n'anyasi, Chere Ya:
Ọ gaabia kwa d'ik'ony'ori: Chere Ya: