Full Lyrics
VERSE 1
Mmiri nke ndụ n'ezosike,
Ifufe nke ndụ n'efesike,
Ebili mmiri na aghara
Juputara n'ebe niile n'ụwa.
VERSE 2
Ekwensu, dịka ok'ọdụm,
Nke n'agbụja nke iwe dị,
N'ejegharị na ebe dum,
N'achọsike onye ọ g'elomi.
VERSE 3
Ndisi nk'ụwa na ndị dike,
Ndị d'akọ, na ndị maar'ihe:
Ndịa n'ezipụta onwe ha
N'arụ ndị ọnọdụ ha dị ala.
VERSE 4
Biko, k'obim dị n'aka Gị,
K'ụzọm bụrụ nke I ziri,
K'am wee zoro na ndo nke Gị,
Ebe udo n'ọṅụ zuroke dị.
CHORUS
Chebe m'o, chebe m'o,
Chebe m'o, Nna,
N'a m'amana njọ, Nna,
Chebe nwa I.