Full Lyrics
REFRAIN
Onyenw'anyi meenu k'im'uche Gi buru nri m.
Ka aguu im'uche Gi chuwe m'ura.
Ka im'uche Gi nyewe m af'ojuju.
VERSE 1
Ngozi di elu n'agba h'okirikiri, n'ezie,
amara zur'oke n'awa k'iyi na ndu ha, bu ndi
n'anabata uche Chineke.
VERSE 2
Jesu, Virgin Maria na ndi Nso nile mer'uche
Nna, ha hujuru anya. Mana ha nozi n'otit'ugbua.
Nna mee, mee k'anyi si n'ahuhu mez'uche Gi, wee
ket'anuri. Anuri Gi di ebigh'ebi.
VERSE 3
Uche Chukwu, Uche Chukwu. Uche Chukwu, Uche
Ka ndi muoma mer'uche Gi, O Chineke,
na ndi Nso mer'uche Gi noru b'anyi okirikiri
mgb'ebili nk'uwa ji atu anyi.
VERSE 4
Jesu, onye Nri Ya bu im'uche Nna, riotar'anyi
ngozi ime na inabata Uche Nna,
ka n'ahuhu, ka n'anuri.