Nnụnụ Ọma Chineke Kere by Gerald C. Ani — Lyrics

Gerald C. Ani Igbo Folk songs Concert Celebrations Solfa notation

Full Lyrics

Lekenu ugo nnụnụ ọma Chineke kere Chọọ ya mma were ya jaa ụwa mma Anya kiribe kiribe kiribe Aka kuba kuba kuba kuba kuba Ukwu jebe jebe jebe jebe jebe Ọnụ kwube kwube kwube kwube kwube Onye gaahụ ihe dị k'ugo n'ebe niile. Ị ma n'ugo bere n'ọjị bere n'okosisi Nnụnụ ọma Nnụnụ ọma, ugo bere n'ọjị bere n'okosisi. Onye hụrụ ugo jaa ya mma n'anaghị ahụ ugo daa. Anya ya, anya chọrọ mma Ukwu ya, ukwu achọrọ mma Obi ya ezigbo obi ọma Ije ya, ezi ije awele. Ị ma n'ugo bere n'ọjị bere n'okosisi.

Download the sheet music

Nnụnụ Ọma Chineke Kere

Nnụnụ Ọma Chineke Kere

By Gerald C. Ani
Solfa
Igbo
2 pages
8 Downloads
Folk songs Concert Celebrations
0 0

More lyrics you may want