EWU ONYE EZE by Ngozi Louis Ekezie — Lyrics

Ngozi Louis Ekezie Igbo Folk songs Concert Non-Liturgical / Special Choir Arrangements Solfa notation

Full Lyrics

Mhum, hum, M hum, hum, M hum, hum, M hum, hum. Ndị be anyị o o o, Ndị be anyị o o o, Ndị be anyị o o o, Ndị be anyị o o o. Ọ dị be eze kwekwe n'al'anyị o, Ọ sị na eze tiri iwu n'al'anyị o. Anụ mere atụrụ, a g'egbu ya o, Nkịta mere atụrụ, alịka mere atụrụ, Ovukome mere atụrụ, a g'egbu ya o. Nwaologbo mere atụrụ, eze wetanu, A g'egbu ya o, eze wetanu. Nwa ewu na nkịta gị o kegbue duniya, Duniya, duniya, duniya, duniya, duniya. Duniya, duniya, duniya, duniya, ewu tarapka n'ikpe o, Maghị ya a, duniya, duniya, duniya. Mhum, hum, M hum, hum, M hum, hum, M hum, hum. Ewu onye eze gara n'ubi nwa'gadi, Ewu onye eze gara n'ubi nwa'gadi. Lekwa ka nwa'gadi ma azọzọ, Mana eze sị na ya gaghị ekwe n'ewu tarapka n'ikpe o, Maghị ya a, duniya, duniya, duniya. Mhum, hum, M hum, hum, M hum, hum, M hum, hum. Ndị be anyị o, Ndị be anyị o, Ndị be anyị o, Ndị be anyị o. K'ụnụ matakwa, k'ụnụ matakwa, k'ụnụ Ndị be anyị o, nweenụ ndidi, Tụkwasị obi na ndị be anyị o, nweenụ ndidi, Matakwa ma nwee ndidi. Chukwu, iwu obodo bụ maka ụmụ ogbenye, Chukwu, iwu obodo bụ maka ụmụ ogbenye. Chukwu, Ọ bụ ya g'ekpe ikpe na njedebe, ogbenye ṅụrịwa.

Download the sheet music

EWU ONYE EZE

EWU ONYE EZE

By Ngozi Louis Ekezie
Solfa
Igbo
5 pages
4 Downloads
Folk songs Concert Non-Liturgical / Special Choir Arrangements
0 0

More lyrics you may want