CHUKWU GOZIE NDI NNA by Sir Jude Nnam & Fr. Chinenye Oluoma — Lyrics

Sir Jude Nnam & Fr. Chinenye Oluoma Igbo Fathers songs Celebrations Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[Refrain] Chukwu biko goziere m Nna mo, ezigbo Papa, o huru m n'anya. Chukwu Onye ker'uwa, Chukwu Onye di ndu, gozie Papa mo! [Verse 1] Ndi nna, unu ji olu. Ndi nna, unu jikwa nnukwu olu. Onye nna ya di ndu, ya lezie y'anya, makana ngozi nna, o bu ya n'edu nwa. Mgbe ogbajuru doro, ndi nna ka a n'akpo! Ihe sib'ike, akpoba ndi nna! Ndi nna Odogwu! Ndi nna Odogwu! Ndi nna, unu b'odogwu n'em'ihe sir'ike! [Verse 2] Anom n'iru Gi n'asi Gi Nna, goziere m Papa mo, onye merem kam di ndu taa, goziere m daddy mo. Aaee! Nyezienu ya ahu sir'ike, ogologo ndu n'ahu sir'ike, amamihe kam n'ayo. Aaee! Chukwu zam'ekpere mo, goziere m nna muru m, nna zuru m, nna huru m n'anya. Aaee! Goziere m Papa mo! Goziere m nna muru m, nna zuru m, nna huru m n'anya. [Verse 3] Akwa mara nma maka Papa. Akpukp'ukwu mara nma maka Papa. Ihe olu mara nma maka Papa mo, Ugegb'anya mara nma maka Papa. Ulo mara nma kam g'aru lu Papa mo! Moto mara nma kam g'ego lu Papa mo! Mmany'oku kar'aka bu nke Papa. Nsopuru pur'iche, kam g'enye Papa mo!

Download the sheet music

CHUKWU GOZIE NDI NNA

CHUKWU GOZIE NDI NNA

By Sir Jude Nnam & Fr. Ch...
Staff & Solfa
Igbo
8 pages
5 Downloads
Fathers songs Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want