Eze Amulu Ohuru by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Christmas Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ih'akuko emeelanuo, onye obula gbabegwu!! Uwa niile golibenuo n'amulu Eze uwa niile. Eh! Kanyi golibenuo, egwu oma eh! nuliba. Le Kristi abiago. Amulu ya n'ulo anu na Bethlehem Judea! Kanyi jeenu, kanyi jeenu, kelee Eze uwa niile. Le Kristi mo Eze amulu ohuru. VERSE 1 Lee ka ebubere ya n'agbuke, ku nw'ohuru ya n'agbuke na nw'ohuru ya. Okpar' Eze nk'udo mma. Emmanuel, Ony'ukwu, Onyenzoputanyi. VERSE 2 Kpakpando n'amuke n'amuke n'igwe, Kpakpando n'amuke. O n'amuke. Kpakpando n'amuke O n'egosiy uwa eba amulu Jesu. Ndi nche tulu Kpakpando n'amuke, O n'amuke, n'amuke. O ji ozi na ije gbagaba n'ul'anu oge ha nulu ozi. Ndi Eze ato si n'owuw'anyanwu bia ha n'ache Ez'uwa. Ha chota ya nihi na Kpakpando n'amuke. VERSE 3 Ndi Muozi doo, kwekenenu kwa, kwebenukwe. Kwer'ozo! Wedatanu ebube Chineke n'elu kacha, ebe Chineke n'im'obi ndi mmadu. Kwebenu udo n'ezie, udo Chineke, udo diri ndi mmadu, ndi ihe ha naaso Chukwu.

Download the sheet music

Eze Amulu Ohuru

Eze Amulu Ohuru

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Christmas Hymns
0 0

More lyrics you may want