Full Lyrics
[UKWE MBATA]
Etu Jesu siri nwụọ kulite kwa n'ọnwụ,
etu ahụ ka Nna gaesi kulite ndị niile nwụrụ na Kristi.
Etu mmadụ niile siri keta ọnwụ n'aka Adam,
etu ahụ ka mmadụ niile gaesi keta ndụ n'aka Kristi.
Alleluia, Alleluia, Alleluia, Alleluia, Alleluia, Alleluia.
[NNA ZỌPỤTA M N'IHI EBERE GỊ]
Onye nwe m Chineke mee ebere,
zọpụta m n'ihi ebere gị.
Chukwu Nna biko e jina iwe abara m mba,
Nna e jina ọnụma ta m ahụ.