Full Lyrics
CHORUS
K'anyi kpọ isiala nye Onye nwe anyi,
K'anyi kpọ isiala nye Osebruwa Onye ker'eligwe n'ala.
VERSE 1
Ụmụ Chukwu k'anyi jee,
K'anyi jee n'ụlọ Onye nwe anyi,
K'anyi jee gburu Ya ikpere daara Ya n'ala.
VERSE 2
Onye ọbụla kulite k'anyi jee,
K'anyi jee kele Chineke tụọrọ Ya mmamma.
VERSE 3
Aja dị nsọ k'anyi n'achụ nye Ya,
Aja dị oke ọnụ k'anyi n'achụ.
VERSE 4
Batawanụ, unu bụ ndị nke Ya,
Batawanụ k'anyi kele Chukwu.