Full Lyrics
REFRAIN
Lee ka ebe'obibi gị si maa mma,
Lee ka ebe'obibi gị siri dị mma,
Lee nụ lee nụ ụlọ gị siri dị mma,
Ụlọ Chukwu ụlọ Chukwu
K'osi maa mma ebe'obibi gị oh!
Osebulụwa nke igwe ndị agha.
VERSE 1
Ngozi dịrị ndị tụkwasara obi na Dinwenu,
Ndị bi n'ụlọ gị onyenwe'anyị
Ha ga eto gị ebighebi.
VERSE 2
Ndị kwere na gị oh Onyenwanyị,
Ndị tụkwasara obi ha n'enye maka gị,
Ị ga azụ ha n'ebe gị dị asọ.
VERSE 3
Akpịrị n'akpọ mkpụrụ'obi mụ nkụ maka gị.
Agụụ ụlọ gị n'agụ mkpụrụ'obi mụ,
Ahụ mụ na mkpụrụ'obi mụ n'achọ gị Chukwu dị ndụ.