EKWERE M N'OTU CHINEKE by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Creed (I believe) Mass Settings Solfa notation

Full Lyrics

INTRO Ekwere m, Ekwere m, Ekwere mo! Ekwere m, n'otu Chineke. VERSE 1 Nna ji ike niile Onye mer' e ligwe na ala na ihe niile a pụrụ ịhụ anya na ndị apụghị ịhụ anya. REFRAIN Ekwere m, Ekwere m, Ekwere mo! Ekwere m, n'otu Chineke. Ekwere m, Ekwere m, Ekwere mo! Ekwere m, n'otu Chineke. VERSE 2 Ya na n'otu Onye nwe anyị Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ, Nna mụrụ tupu ụwatụwa niile Chukwu si na Chukwu ihe si n'ihe, Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu. VERSE 3 Amụrụ amụ emeghị eme Ya na Nna bụ otu ihe n'ọdịdị ebighebi Ha ji bụrụ Chukwu: Onye e si na Ya mee ihe dum Onye maka'hi anyị bụ mmadụ na Maka'hi nzọpụta anyị siri n'eluigwe gbadata. VERSE 4 Ọ were ahụ na Virgin Maria; site na Mmụọ Nsọ Ọ bụrụ mmadụ. A kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị, n'oge ọchịchị Pontius Pilate; Ọ taa ahụhụ, nwụọ, e lie Ya. Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ k'Akwụkwọ Nsọ, k'Akwụkwọ Nsọ si kwu Ọ rọgoro n'eluigwe nọrọ n'aka nri Nna ma Ọ gaa biaghachi ọzọ n'ebube Ya, ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe Onye ọchịchị Ya naenweghị njedebe. VERSE 5 Ekwere m na Mmụọ Nsọ Dinwenu na Onye naenye ndụ: Onye si na Nna na Nwa pụta Onye a naesekpuru naetokọdọ Ya na Nna na Nwa Onye si na ndị amụma kwu okwu. VERSE 6 Ekwere m na Nzukọ nke dị otu, dị nsọ, bụrụ Katolik na Apostolik. Ekwupụta m otu mmiri chukwu maka mgbaghara njọ ga. Ana m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịa nụ. Amen, Amen, Amen, Amen!

Download the sheet music

EKWERE M N'OTU CHINEKE

EKWERE M N'OTU CHINEKE

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
2 pages
4 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings
0 0

More lyrics you may want