Full Lyrics
INTRO
Ekwere m, Ekwere m, Ekwere mo!
Ekwere m, n'otu Chineke.
VERSE 1
Nna ji ike niile Onye mer' e ligwe na ala
na ihe niile a pụrụ ịhụ anya
na ndị apụghị ịhụ anya.
REFRAIN
Ekwere m, Ekwere m, Ekwere mo!
Ekwere m, n'otu Chineke.
Ekwere m, Ekwere m, Ekwere mo!
Ekwere m, n'otu Chineke.
VERSE 2
Ya na n'otu Onye nwe anyị Jesu Kristi,
sọ otu Nwa Chineke mụrụ,
Nna mụrụ tupu ụwatụwa niile
Chukwu si na Chukwu ihe si n'ihe,
Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu.
VERSE 3
Amụrụ amụ emeghị eme
Ya na Nna bụ otu ihe n'ọdịdị ebighebi
Ha ji bụrụ Chukwu:
Onye e si na Ya mee ihe dum
Onye maka'hi anyị bụ mmadụ na
Maka'hi nzọpụta anyị siri n'eluigwe gbadata.
VERSE 4
Ọ were ahụ na Virgin Maria;
site na Mmụọ Nsọ Ọ bụrụ mmadụ.
A kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị,
n'oge ọchịchị Pontius Pilate;
Ọ taa ahụhụ, nwụọ, e lie Ya.
Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ
k'Akwụkwọ Nsọ, k'Akwụkwọ Nsọ si kwu
Ọ rọgoro n'eluigwe nọrọ n'aka nri Nna
ma Ọ gaa biaghachi ọzọ n'ebube Ya,
ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ
ikpe Onye ọchịchị Ya naenweghị njedebe.
VERSE 5
Ekwere m na Mmụọ Nsọ Dinwenu na Onye naenye ndụ:
Onye si na Nna na Nwa pụta
Onye a naesekpuru naetokọdọ Ya na Nna na Nwa
Onye si na ndị amụma kwu okwu.
VERSE 6
Ekwere m na Nzukọ nke dị otu, dị nsọ,
bụrụ Katolik na Apostolik.
Ekwupụta m otu mmiri chukwu
maka mgbaghara njọ ga.
Ana m atụ anya mbilite n'ọnwụ
ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịa nụ.
Amen, Amen, Amen, Amen!