EKWEREM N'OTU CHINEKE by Anaele Chukwuebuka Romanus Francis — Lyrics

Anaele Chukwuebuka Romanus Francis Igbo Creed (I believe) Hymns Solfa notation

Full Lyrics

Ekwerem n'otu Chineke Nna ji ike niile Onye mere igwe n'ala ekwerem n'otu Chukwu Ihe a naahụ anya na nke a naaghị ahụ anya nya n'otu Onyenweanyị Jesu Kristi So otu Nwa Chineke a mụrụ na Nna A mụrụ tupu atụwa ụwa niile Chukwu si na Chukwu, ihe si n'ihe Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu A mụrụ Ya, a mụrụ Ya emeghị Ya eme Ya na Nna bụ otu Ha jiri buru Chukwu Onye si na Ya mee ihe dum Onye maka ihi anyị bụ mmadụ Na maka ihi nzọpụta anyị Siri n'eligwe gbadata O were ahụ na Vejin Marịa O buru mmadụ akpọgbuo Ya n'obe n'ihi anyị N'ọgọchịchị Pọntus Paịlet Ọ taa ahụhụ nwụọ elie Ya Ma O bilitere n'ụbọchị nke atọ Ka Akwụkwọ Nsọ siri kwuo Ọ rọgọrọ n'eluigwe Nọrọ n'aka nri Nna ma Ọ gaabịghachio Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ Ikpe Ọnyeọchịchị Ya n'enweghị njedebe Ekwerem na Mmụọ Nsọ Dinwenu n'Onye n'enyendụ Onye si na Nna na Nwa pụta Onye a naasekpụrụ na etokodo Ya na Nna na Nwa Onye si na ndị amụma kwuọ okwu Ekwerem na Nzukọ nke dị otu Dị Nsọ bụrụ Katọlik n'Apọstọlik Ekwupụta m otu mmiri Chukwu Maka mgbaghara njọ A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ Ndị nwụrụ anwụ na ndụ ụwa gaabịa nụ Amen, Amen, Amen, Amen

Download the sheet music

EKWEREM N'OTU CHINEKE

EKWEREM N'OTU CHINEKE

By Anaele Chukwuebuka Rom...
Solfa
Igbo
3 pages
5 Downloads
Creed (I believe) Hymns
0 0

More lyrics you may want