Full Lyrics
Ekwem ekwem n'otu Chineke Nna,
Nna ji ike nile;
onye mere eligwe n'ala,
n'ihe nile a na ahua nya.
Ya n'otu Onyenweanyi Jesu Kristi,
so otu nwa Chineke muru'
Nna muru tup' uwa tuwanile.
Chukwu ìhèsi na ìhè, Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu.
Ya na Nna bu otu ihe n'odi di ebighebi
ha ji buru Chukwu,
Ony'e si na ya mee ihe dum.
na ma k'ihi nzoput' anyi
siri n'eligwe, siri n'eligwe, siri n'eligwe gbadata.
O weer' ahu na Virgin Maria,
site na Muo Nso o buru mmadu.
Akpogbuo ya n'eluobe n'ihianyi
n'oge ochichi Pontius Pilate,
O t'ahuhu, o t'ahuhu o nwuo, elie ya.
Ma O bilitere O bilitere O bilitere O bilitere Ma O bilitere
n'ubosi nke ato k'akwukwo nso, k'akwukwo nso si kwu.
O rogoro n'eluigwe o rogo ro n'eluigwe
noro n'aka nri Nna.
Ikpe ndi di ndu na ndi nwur' anwu ikpe,
onye ochichi ya n'enweghi njedebe.
E kwerem na Muo Nso,
Dinwenu n'onye n'enye ndu.
Onye si na Nna, onye si na Nna na Nwa puta,
onye si na Nna na Nwa puta,
Ony'a nae sekpuru n'eto
kodo ya na Nna na Nwa,
onye si na ndi amuma kwu'okwu.
E kwerem na Nzuko nke diotu di nso
buru Catholic burukwa Apostolic.
Ekwuputa m otu mmiri Chukwu
maka mgbaghara njo.
A na m atuanya anya mbilite n'onwu
ndi nwuruanwu na ndu uwa g'a bianu.
Amen, Amen, Amen.