EKWEM N'OTU CHINEKE by Virgilus C. Eze — Lyrics

Virgilus C. Eze Igbo Creed (I believe) Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Ekwem n'otu Chineke, Nna onye ji ike nile, Ekwem n'otu Chineke, Nna onye mere eluigwe n'ala. [VERSE 1] N'ihe nile apụrụ ịhụ anya, Na ndị apụghị ịhụ anya. [VERSE 2] Sọ otu nwa Chineke mụrụ, Nna mụrụ tupu ụwatụwa nile. Chukwu si na Chukwu, ihe si n'ihe, Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu, Amụrụ ya amụ emeghị ya eme. [VERSE 3] Ya na Nna bụ otu ihe n'ọdịdị, Ebighebi ha ji bụrụ Chukwu. Onye e si na ya mee ihe nile, Onye maka ihi anyị bụ mmadụ. [VERSE 4] Na maka ihi nzọpụta anyị, Siri n'eluigwe gbadata. O were ahụ na Virgin Maria, Site na mmụọ nsọ ọ bụrụ mmadụ. [VERSE 5] A kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị, N'oge ọchịchị Pontius Pilate. Ọ taa ahụhụ nwụọ elie ya, Ma ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ. [VERSE 6] Ka akwụkwọ nsọ siri kwuo, Ọ rọgọrọ n'eluigwe nọrọ n'aka nri Nna. Ma ọ gaabiaghach'ọzọ n'ebube, Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe ya. [VERSE 7] Onye ọchịchị ya enweghị njedebe. Ekwem na mmụọ nsọ Dinwenu n'onye naenye ndụ, Onye si na Nna na nwa pụta, Onye a naesekpuru. [VERSE 8] N'eto kọdọ ya na Nna na Nwa, Onye si na ndị amụma kwuo okwu. E kwerem n'otu nzukọ nke dị otu dị nsọ, Bụrụ Katholic n'apostolic. [VERSE 9] E kwuputam otu mmirichukwu, Maka mgbaghara njọ. Ga a na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, Na ndụ ụwa gaabịanụ. Amen.

Download the sheet music

EKWEM N'OTU CHINEKE

EKWEM N'OTU CHINEKE

By Virgilus C. Eze
Solfa
Igbo
3 pages
9 Downloads
Creed (I believe) Hymns
0 0

More lyrics you may want