Full Lyrics
[REFRAIN]
Ekwem n'otu Chineke,
Nna onye ji ike nile,
Ekwem n'otu Chineke,
Nna onye mere eluigwe n'ala.
[VERSE 1]
N'ihe nile apụrụ ịhụ anya,
Na ndị apụghị ịhụ anya.
[VERSE 2]
Sọ otu nwa Chineke mụrụ,
Nna mụrụ tupu ụwatụwa nile.
Chukwu si na Chukwu, ihe si n'ihe,
Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu,
Amụrụ ya amụ emeghị ya eme.
[VERSE 3]
Ya na Nna bụ otu ihe n'ọdịdị,
Ebighebi ha ji bụrụ Chukwu.
Onye e si na ya mee ihe nile,
Onye maka ihi anyị bụ mmadụ.
[VERSE 4]
Na maka ihi nzọpụta anyị,
Siri n'eluigwe gbadata.
O were ahụ na Virgin Maria,
Site na mmụọ nsọ ọ bụrụ mmadụ.
[VERSE 5]
A kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị,
N'oge ọchịchị Pontius Pilate.
Ọ taa ahụhụ nwụọ elie ya,
Ma ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ.
[VERSE 6]
Ka akwụkwọ nsọ siri kwuo,
Ọ rọgọrọ n'eluigwe nọrọ n'aka nri Nna.
Ma ọ gaabiaghach'ọzọ n'ebube,
Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe ya.
[VERSE 7]
Onye ọchịchị ya enweghị njedebe.
Ekwem na mmụọ nsọ Dinwenu n'onye naenye ndụ,
Onye si na Nna na nwa pụta,
Onye a naesekpuru.
[VERSE 8]
N'eto kọdọ ya na Nna na Nwa,
Onye si na ndị amụma kwuo okwu.
E kwerem n'otu nzukọ nke dị otu dị nsọ,
Bụrụ Katholic n'apostolic.
[VERSE 9]
E kwuputam otu mmirichukwu,
Maka mgbaghara njọ.
Ga a na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ,
Na ndụ ụwa gaabịanụ. Amen.